Levitikọs 14:39-44 Bible Nso (IGBOB)

39. onye-nchu-àjà gābiaghachi n'ubọchi nke-asa, le kwa anya: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu aba aba na mb͕idi ulo;

40. onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka ha dọpu nkume nile nke ihe-otiti ahu di nime ha, tubà ha n'azu obodo, n'ebe ruru árú:

41. ọ gēme kwa ka akpucha ulo ahu nime buruburu, ha gāwusi kwa ájá nke ha kpuchapuru n'azu obodo, n'ebe ruru árú:

42. ha gēweta kwa nkume ọzọ, me ka ha ba n'ọnọdu nkume ahu: ájá ọzọ ka ọ gēwere kwa, te ulo ahu.

43. Ma ọ buru na ihe-otiti ahu alaghachi, b͕awaputa n'ulo ahu, mb͕e ọ dọpusiri nkume ahu, mb͕e ọ kpuchasi-kwa-ra ulo ahu, mb͕e etesi-kwa-ra ya;

44. onye-nchu-àjà gābata kwa, le anya, ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu abawo aba n'ulo, ekpenta jọb͕uru onwe-ya ka ọ bu nke di n'ulo: ihe ruru árú ka ọ bu

Levitikọs 14