Levitikọs 14:38-48 Bible Nso (IGBOB)

38. onye-nchu-àjà gēsi kwa n'ulo ahu pua rue ọnu-uzọ ulo ahu, mechi kwa ulo ahu ubọchi asa:

39. onye-nchu-àjà gābiaghachi n'ubọchi nke-asa, le kwa anya: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu aba aba na mb͕idi ulo;

40. onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka ha dọpu nkume nile nke ihe-otiti ahu di nime ha, tubà ha n'azu obodo, n'ebe ruru árú:

41. ọ gēme kwa ka akpucha ulo ahu nime buruburu, ha gāwusi kwa ájá nke ha kpuchapuru n'azu obodo, n'ebe ruru árú:

42. ha gēweta kwa nkume ọzọ, me ka ha ba n'ọnọdu nkume ahu: ájá ọzọ ka ọ gēwere kwa, te ulo ahu.

43. Ma ọ buru na ihe-otiti ahu alaghachi, b͕awaputa n'ulo ahu, mb͕e ọ dọpusiri nkume ahu, mb͕e ọ kpuchasi-kwa-ra ulo ahu, mb͕e etesi-kwa-ra ya;

44. onye-nchu-àjà gābata kwa, le anya, ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu abawo aba n'ulo, ekpenta jọb͕uru onwe-ya ka ọ bu nke di n'ulo: ihe ruru árú ka ọ bu

45. Ọ gākwatu kwa ulo ahu, bú nkume-ya nile, na osisi-ya nile, na ájá nile nke ulo ahu: o gēbupu kwa ha je n'azu obodo, n'ebe ruru árú.

46. Ọzọ, onye nābà n'ulo ahu ubọchi nile o mechiri ya gāru árú rue anyasi.

47. Onye nēdina kwa n'ulo ahu gāsu uwe-ya nile; ọzọ, onye nēri ihe n'ulo ahu gāsu uwe-ya nile.

48. Ma ọ buru na onye-nchu-àjà abata nime, le anya, ma, le, ihe-otiti ahu abaghi aba n'ulo ahu, mb͕e etesiri ulo ahu; onye-nchu-àjà gāsi kwa na ulo ahu di ọcha, n'ihi na emewo ka ihe-otiti ahu la.

Levitikọs 14