1. Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si ha,
2. Gwanu umu Israel okwu, si, Ndia bu anu di ndu unu gēri n'etiti anumanu nile nke di n'elu uwa.
3. Anu ọ bula nke ukwu-ya wara njakpa, nke ukwu-ya wara-kwa-ra awara, nke nātaghari kwa ọnu, n'etiti anumanu, nke ahu ka unu gēri.
4. Otú ọ di, ndia ka unu nāgaghi-eri n'etiti ihe nātaghari ọnu, ma-ọbu n'etiti ndi ukwu-ha wara njakpa: camel, n'ihi na ihe nātaghari ọnu ka ọ bu, ma ọ bughi ihe ukwu-ya wara njakpa, ihe ruru árú ka ọ buru unu.
5. Coney kwa, n'ihi na ihe nātaghari ọnu ka ọ bu, ma ukwu-ya awaghi njakpa, ihe ruru árú ka ọ buru unu.
6. Hare kwa, n'ihi na ihe nātaghari ọnu ka ọ bu, ma ukwu-ya awaghi njakpa, ihe ruru árú ka ọ buru unu.
7. Ezì kwa, n'ihi na ihe ukwu-ya wara njakpa, nke ukwu-ya wara-kwa-ra awara, ka ọ bu, ma ya onwe-ya adighi-ataghari ọnu, ihe ruru árú ka ọ buru unu.
8. Unu erila ihe sitere n'anu-ha, unu emetu-kwa-la ozu-ha aka; ihe ruru árú ka ha buru unu.
9. Ndia ka unu gēri n'etiti ihe nile nke di na miri: ihe ọ bula nke nwere ntù na akpilikpa nime miri, n'oké osimiri nile, na n'osimiri nile, ha ka unu gēri.
10. Ma ihe ọ bula nke nēnweghi ntù na akpilikpa n'oké osimiri nile, na n'osimiri nile, site n'ihe nile nēnuputa na miri, site kwa n'anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke di nime miri, ihe-árú ka ha buru unu,
11. ihe-árú ka ha gābu-kwa-ra unu; unu erila ihe sitere n'anu-ha, unu gāgu kwa ozu-ha n'ihe-árú.
12. Ihe ọ bula nke nēnweghi ntù na akpilikpa nime miri, ihe-árú ka ọ buru unu.