Joshua 6:2-14 Bible Nso (IGBOB)

2. Jehova we si Joshua, Le, enyewom Jeriko, na eze-ya, na ndi-dike nile, bú dinkpà, n'aka-gi.

3. Unu gāb͕a obodo ahu buruburu, ndikom agha nile, nēje obodo ahu buruburu otù ub͕ò. Otú a ka i gēme ubọchi isi.

4. Ndi-nchu-aja asa gēbu kwa opì-ike oké uda asa n'iru ib͕e ahu: ma n'ubọchi nke-asa unu gāb͕a obodo ahu buruburu ub͕ù asa, ndi-nchu-aja gāfù kwa opì-ike asa ahu.

5. Ọ gēru kwa, mb͕e ha gēwere mpi oké uda fù ọfufu-opì di anya, mb͕e unu gānu kwa olu opì-ike ahu, na ndi nkem nile gēti oké nkpu; mb͕idi obodo ahu gāda kwa n'okpuru ya, ndim gārigo kwa, nwoke ọ bula na ncherita-iru ya.

6. Joshua nwa Nun we kpọ ndi-nchu-àjà, si ha, Būrunu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu ahu, ndi-nchu-àjà asa gēbu kwa opì-ike oké uda asa n'iru ib͕e Jehova.

7. Ha we si ndi Israel, Gabiganu, b͕a obodo ahu buruburu, ndi ejikere gāgabiga kwa n'iru ib͕e Jehova.

8. O rue, mb͕e Joshua gwara ndi Israel okwu, ndi-nchu-àjà asa ndi nēbu opì-ike oké uda asa ahu n'iru Jehova we gabiga, we nāfù opì-ike asa ahu: ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova we nējeso ha n'azu.

9. Ndi ejikere we nēje n'iru ndi-nchu-àjà ndi nāfù opì-ike asa ahu, ndi nāchikọta achikọta nējeso kwa ib͕e ahu n'azu, ndi-nchu-àjà nāfù opì-ike asa ahu ka ha nēje.

10. Joshua we nye ndi Israel iwu, si, Unu etila nkpu, unu ekwe-kwa-la ka anu olu-unu, okwu ọ bula agaghi-esi kwa n'ọnu-unu puta, rue ubọchi m'gāsi unu, Tienu nkpu; unu ewe tie nkpu.

11. Ọ we me ka ib͕e Jehova b͕a obodo ahu buruburu, nēje ya buruburu otù ub͕ò: ha we bata n'ọmuma-ulo-ikwū, nọ ọnọdu-abali n'ọmuma-ulo-ikwū.

12. Joshua we bilie n'isi-ututu, ndi-nchu-àjà we būru ib͕e Jehova.

13. Ndi-nchu-àjà asa ahu ndi nēbu opì-ike oké uda asa ahu n'iru ib͕e Jehova nējegide, nāfù kwa opì-ike asa ahu: ndi ejikere nēje kwa n'iru ha; ndi nāchikọta achikọta nējeso kwa ib͕e Jehova n'azu, ndi-nchu-àjà nāfù opì-ike asa ahu ka ha nēje.

14. N'ubọchi nke-abua ha we b͕a obodo ahu buruburu otù ub͕ò, we laghachi n'ọmuma-ulo-ikwū: otú a ka ha mere ubọchi isi.

Joshua 6