Joshua 21:41-45 Bible Nso (IGBOB)

41. Obodo nile nke ndi Livai n'etiti ihe-onwunwe umu Israel di ọgu obodo abua na asatọ na ebe-ita-nri-ha.

42. Obodo ndia di otú a, obodo ọ bula na ebe-ita-nri-ya nile buruburu ya: otú a ka ọ diri obodo ndia nile.

43. Jehova we nye Israel ala ahu nile nke Ọ ṅuru iyi inye ndi bu nna-ha; ha we nweta ya, we biri nime ya.

44. Jehova we me ka ha zuru ike buruburu, dika ihe nile si di nke Ọ ṅuru ndi bu nna-ha iyi: ọ dighi kwa nwoke ọ bula n'etiti ndi-iro-ha nile guzoro n'iru ha; ndi-iro-ha nile ka Jehova nyere n'aka-ha.

45. Ọ dighi ihe ọ bula dapuru n'ezi ihe nile nke Jehova gwara ulo Israel; ha nile mere.

Joshua 21