Joshua 10:5-24 Bible Nso (IGBOB)

5. Eze ise ndi-Amorait, bú eze Jerusalem, na eze Hebron, na eze Jamut, na eze Lekish, na eze Eglon, we chikọta onwe-ha, rigo, ha onwe-ha na ọmuma-ulo-ikwū-ha nile, we ma ulo-ikwū-ha imegide Gibeon, we buso ya agha.

6. Ndikom Gibeon we zigara Joshua ozi rue ọmuma-ulo-ikwū rue Gilgal, si, Arala ndi-orù-gi aka; rigokute ayi ngwa ngwa, zọputa ayi, ye-kwa-ra ayi aka: n'ihi na eze nile nke ndi-Amorait ndi bi n'ugwu achikọtawo onwe-ha imegide ayi.

7. Joshua we si na Gilgal rigo, ya onwe-ya, na ndi-agha nile tiyere ya, na ndi-dike nile, bú ndi-dìnkpà.

8. Jehova we si Joshua, Atula egwu ha: n'ihi na n'aka-gi ka M'nyeworo ha; ọ dighi nwoke nime ha nke gēguzo n'iru gi.

9. Joshua we biakwasi ha na mberede; n'ihi na ogologo abali nile ka o si na Gilagal rigo.

10. Jehova we chusa ha n'iru Israel, o tib͕ue ha oké ntib͕u na Gibeon, we chusa ha n'uzọ nrigo Bet-horon, tib͕ue ha rue Azeka, ru kwa Makeda.

11. O rue, mb͕e ha si n'iru Israel b͕alaga, mb͕e ha nọ na nrida Bet-horon, na Jehova si n'elu-igwe tudakwasi ha nkume uku rue Azeka, ha we nwua: ndi nwuru na nkume ákú-miri-ígwé ahu kariri ndi umu Israel were mma-agha b͕ue.

12. Mb͕e ahu Joshua gwara Jehova okwu n'ubọchi Jehova rara ndi-Amorait nye n'iru umu Israel; o we si n'anya Israel,Anyanwu, guzo du n'elu Gibeon;Gi Ọnwa kwa, na ndagwurugwu Ajalon.

13. Anyanwu we guzo du, ọnwa guzo-kwa-ra,Rue mb͕e mba ahu bọsiri ọ́bọ̀ n'aru ndi-iro-ha.Èdeghi nka n'akwukwọ Jasha? Anyanwu we guzo n'etiti elu-igwe, o meghi kwa ngwa ida ihe ra ka otù ubọchi zuru ezu.

14. Ọ dighi kwa ubọchi di ka ubọchi ahu n'iru ya ma-ọbu n'azu ya, na Jehova gere nti olu madu: n'ihi na Jehova nēburu Israel agha.

15. Joshua we lata, ya na Israel nile, rue ọmuma-ulo-ikwū rue Gilgal.

16. Eze ise ndia we b͕alaga, zo onwe-ha n'ọb͕à na Makeda.

17. Ewe gosi Joshua, si, Achọtawo eze ise ahu, ha ezowo onwe-ha n'ọb͕à na Makeda.

18. Joshua we si, Kpọrenu nkume uku rue ọnu ọb͕à ahu, do kwa ndikom n'elu ya dika ndi-nlekọta idebe ha:

19. ma unu onwe-unu eguzola; nāchunu ndi-iro-unu n'azu, tib͕u kwa ndi-ikpe-azu n'etiti ha; unu ekwela ka ha ba n'obodo di iche iche ha: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, enyewo ha n'aka-unu.

20. O rue, mb͕e Joshua na umu Israel tib͕usiri ha oké ntib͕u nke-uku, rue mb͕e emere ka ha gwusia, mb͕e ndi fọduru, bú ndi fọduru n'etiti ha, basi-kwa-ra n'obodo ewusiri ike,

21. na ndi Israel nile latara n'ọmuma-ulo-ikwū jekuru Joshua na Makeda n'udo: ọ dighi nwoke raghariri ire-ya megide umu Israel.

22. Joshua we si, Meghenu ọnu ọb͕à ahu, me kwa ka eze ise ndia si n'ọb͕à ahu pukutem.

23. Ha we me otú a, me ka eze ise ahu si n'ọb͕à ahu pukute ya, bú eze Jerusalem, na eze Hebron, na eze Jamut, na eze Lekish, na eze Eglon.

24. O rue, mb͕e ha mere ka eze ise ahu pukute Joshua, na Joshua kpọrọ ndikom nile nke Israel, si ndi-ọchi-agha nke ndikom agha ndi soro ya je, Bianu nso, zọkwasinu ukwu-unu n'olu eze ndia. Ha we bia nso, zọkwasi ukwu-ha n'olu-ha.

Joshua 10