38. Mu onwem zigara unu iwere ihe ubi nke ọ dighi mb͕e unu onwe-unu dọb͕uworo onwe-unu n'ilu ya: ndi ọzọ adọb͕uwo onwe-ha n'ọlu, unu onwe-unu abàwo kwa na ndọb͕u-ha.
39. Ma ọtutu ndi Sameria si n'obodo ahu kwere na Ya n'ihi okwu nwanyi ahu, onye b͕ara àmà, si, Ọ gwaram ihe nile m'mere.
40. Ya mere mb͕e ndi Sameria biakutere Ya, ha riọ Ya ka Ọ nọyere ha: O we nọgide n'ebe ahu ubọchi abua.
41. Ma ndi kwere n'ihi okwu-Ya kariri ri nne;
42. ha we si nwanyi ahu, Ọ bughi n'ihi ihe i kwuru ka ayi nēkwe ub͕u a: n'ihi na ayi onwe-ayi anuwo, mata kwa na Onye a bu Onye-nzọputa nke uwa n'ezie.
43. Ma mb͕e ubọchi abua ahu gasiri, O si n'ebe ahu pua ba na Galili.
44. N'ihi na Jisus onwe-ya b͕ara àmà, na adighi-asọpuru onye-amuma n'ala nke aka ya.
45. Ya mere mb͕e Ọ biara na Galili, ndi Galili nara Ya nke-ọma, ebe ha hururi ka ihe O mere na Jerusalem ra n'ememe: n'ihi na ha onwe-ha je-kwa-ra ememe ahu.
46. Ya mere Ọ biaruru Kena nke Galili ozọ, ebe O mere miri ka ọ ghọ manya-vine, Ma otù nwoke nke nējere eze ozi di, nke aru nādighi nwa-ya nwoke ike na Kapanaum.
47. Mb͕e onye ahu nuru na Jisus esiwo na Judia puta ba na Galili, o jekuru Ya, riọ Ya ka Ọ ridata, me ka aru di nwa-ya ike; n'ihi na ọ nọ n'ọnu ọnwu.
48. Ya mere Jisus siri ya, Ọ buru na unu ahughi ihe-iriba-ama na ọlu-ebube, unu agaghi-ekwe ma-ọli.
49. Nwoke ahu nke nējere eze ozi si Ya, Onye-nwe-ayi, ridata mb͕e nwatakirim akānwughi.
50. Jisus si ya, Ga nke gi; nwa-gi nwoke di ndu. Nwoke ahu kwere okwu Jisus gwara ya, o we ga nke ya.
51. Ma mb͕e ọ nọ nārida ub͕u a, ndi-orù-ya zutere ya, si, na nwa-ya di ndu.
52. Ya mere ọ juru ha oge hour nke aru-ya malitere idi ya nma. Ya mere ha siri ya, Nnyahuru n'oge hour nke-asa ka aru-ọku rapuru ya.
53. Ya mere nna-ya mara na ọ bu n'oge hour ahu mb͕e Jisus siri ya, Nwa-gi nwoke di ndu: ya onwe-ya we kwere na èzí-na-ulo-ya dum.
54. Nka bu ihe-iriba-ama ọzọ nke mere ha abua nke Jisus mere, mb͕e O siri na Judia puta ba na Galili.