Jọn 4:16-26 Bible Nso (IGBOB)

16. Jisus si ya, Laba, kpọ di-gi, bia kwa n'ebe a.

17. Nwanyi ahu zara, si Ya, Enweghm di. Jisus si ya, I kwuru nke-ọma, si, Enweghi m di:

18. n'ihi na i nwewo di ise; ma onye i nwere ub͕u a abughi di-gi: nka ka i kwuworo n'ezie.

19. Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, ahurum na Gi onwe-gi bu onye-amuma.

20. Nna-ayi-hà nile kpọrọ isi ala nye Chineke n'ugwu a; ma unu onwe-unu si, na ebe madu aghaghi ikpọ isi ala nye Chineke di nime Jerusalem.

21. Jisus si ya, Nwanyi, kwerem, oge hour nābia, mb͕e unu nāgaghi-akpọ isi ala nye Nnam, ma ọ bu n'ugwu a, ma-ọbu na Jerusalem.

22. Unu onwe-unu nākpọ isi ala nye ihe unu nāmatagh: ayi onwe-ayi nākpọ isi ala nye ihe ayi matara: n'ihi na nzọputa si n'etiti ndi-Ju puta.

23. Ma oge hour nābia, ub͕u a ka ọ di kwa, mb͕e ndi nākpọ isi ala n'ezie gākpọ isi ala nye Nnam nime mọ na ezi-okwu: n'ihi na ndi di otú ahu ka Nnam nāchọ kwa ka ha buru ndi nākpọ isi ala nye Ya.

24. Chineke bu Mọ: ndi nākpọ kwa isi ala nye Ya aghaghi ikpọ isi ala nime mọ na ezi-okwu.

25. Nwanyi ahu si Ya, Amataram na Mesaia nābia (Onye anākpọ Kraist): mb͕e ọ bula Onye ahu gābia, Ọ gākọrọ ayi ihe nile.

26. Jisus si ya, Mu onwem Nke nāgwa gi okwu bu Ya.

Jọn 4