Jọn 21:9-13 Bible Nso (IGBOB)

9. Ya mere mb͕e ha ridara n'ala, ha hu ọku icheku n'ebe ahu, na azù atukwasiri ya, na ob͕e achicha.

10. Jisus si ha, Wetanu ufọdu nime azù unu b͕uru ub͕u a.

11. Ya mere Saimon Pita rigoro, dọrọ ihe ha ji eb͕u azù bia n'ala, nke oké azù juru nime ya, ọgu azù asa na iri na atọ: ma ọ bu ezie na azù di ọtutu otú a, ma ihe ha ji eb͕u azù adọkaghi.

12. Jisus si ha, Bianu, rie nri-ututu. Ma ọ dighi onye ọ bula nime ndi nēso uzọ-Ya nwere anya-ike iju Ya, si, Gì onwe-gi bu onye? n'ihi na ha matara na ọ bu Onye-nwe-ayi.

13. Jisus bia, were achicha ahu, nye ha, azù ahu kwa otú ahu.

Jọn 21