Jọn 21:19-25 Bible Nso (IGBOB)

19. Ma nka ka O kwuru, nēgosi aha ọnwu ọ gēji nye Chineke otuto. Mb͕e O kwusiri nka, Ọ si ya, Som.

20. Pita we chigharia, hu onye ahu nke nēso uzọ-Ya, onye Jisus huru n'anya, ka o nēso; onye nādabere kwa n'obi-Ya na nri-anyasi ahu, si, Onye-nwe-ayi, ònye bu onye ahu nke nārara Gi nye?

21. Ya mere Pita, mb͕e ọ huru ya, ọ si Jisus, Onye-nwe-ayi, ma onye a, gini gēme ya?

22. Jisus si ya, Ọ buru na anamachọ ka ọ nọgide rue mb͕e M'gābia, ọ̀ bu gini n'ebe i nọ? gi onwe-gi som.

23. Ya mere okwu a putara n'etiti umu-nna nime Kraist, na onye ahu nke nēso uzọ-Ya agaghi-anwu: ma Jisus asighi ya, na ọ gaghi-anwu; kama, Ọ buru na anamachọ ka ọ nọgide rue mb͕e M'gābia, ọ̀ bu gini n'ebe i nọ?

24. Nka bu onye ahu nēso uzọ Jisus nke nāb͕ara ihe ndia àmà, nke de-kwa-ra ihe ndia n'akwukwọ: ayi mata-kwa-ra na àmà-ya bu ezie.

25. Ma ọtutu ihe ọzọ nke Jisus mere di kwa, nke, ma ọ buru na edere ha n'akwukwọ n'otù n'otù, ọ dim ka ọbuná uwa onwe-ya agaghi-anagide akwukwọ agēde.

Jọn 21