18. Ya mere ndi-Ju zara, si Ya, Ọ̀ bu ihe-iriba-ama gini ka I nēgosi ayi, ebe I nēme ihe ndia?
19. Jisus zara, si ha, Kwatuenu ulo nsọ a, n'ubọchi atọ M'gēweli kwa ya elu.
20. Ya mere ndi-Ju siri, Ọgu arọ abua na isi ka eji wu ulo nsọ a, Gì onwe-gi gēweli kwa ya n'ubọchi atọ?
21. Ma Ya onwe-ya nēkwu okwu bayere ulo nsọ nke bu aru-Ya.
22. Ya mere mb͕e emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ndi nēso uzọ-Ya chetara na O kwuru okwu a; ha we kwere ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ya na okwu Jisus kwuru.