Jọn 1:35-44 Bible Nso (IGBOB)

35. Ọzọ n'echi-ya Jọn guzoro, ya na madu abua nime ndi nēso uzọ-ya;

36. o we le Jisus anya ka Ọ nējeghari, ọ si, Le, Nwa-aturu Chineke!

37. Madu abua ahu ndi nēso uzọ-ya we nu ka ọ nēkwu, ha we so Jisus.

38. Jisus we chigharia, kiri ha ka ha nēso Ya, Ọ si ha, Gini ka unu nāchọ? Ha we si Ya, Rabai (nke isi-ya bu, ma asugharia ya, Onye-ozizí), òle ebe I bi?

39. Ọ si ha, Bianu, unu gāhu kwa. Ya mere ha biara hu ebe O biri; ha na Ya we nọgide ubọchi ahu; ọ di ka oge hour nke-iri.

40. Otù nime madu abua ahu ndi nuru okwu si n'ọnu Jọn puta, ndi so-kwa-ra Ya, bu Andru, nwa-nne Saimon.

41. Onye ahu buru uzọ chọta nwa-nne nke aka ya, bú Saimon, si ya, Ayi ahuwo Mesaia-ayi (nke bu, ma asugharia ya, Kraist).

42. O duru ya biakute Jisus. Jisus lere ya anya, si, Gi onwe-gi bu Saimon nwa Jọn: agākpọ gi onwe-gi Kifas (nke bu Pita, ma asugharia ya).

43. N'echi-ya Ọ chọrọ ipu ga Galili, O we hu Filip: Jisus we si ya, Som.

44. Ma Filip bu onye Betsaida, onye si n'obodo Andru na Pita puta.

Jọn 1