Jọn 1:19-35 Bible Nso (IGBOB)

19. Nka bu kwa àmà Jọn, mb͕e ndi-Ju siri na Jerusalem zigara ya ndi-nchu-àjà na ndi Livai ka ha jua ya, si, Gì onwe-gi bu onye?

20. O we kwuputa, ọ gọghi kwa agọ; ma o kwuputara, si, Mu onwem abughi Kraist ahu.

21. Ha we jua ya, si, Ì bu gini kwa? Gì onwe-gi bu Elaija? Ọ si, Abughi m. Gì onwe-gi bu onye-amuma ahu? O we za, si, É-è.

22. Ya mere ha siri ya, Ì bu onye? ka ayi we nye ndi zitere ayi ihe-ọziza. Ì si gini bayere onwe-gi?

23. Ọ siri, Mu onwem bu olu otù onye nēti nkpu n'ọhia, si, Menu uzọ Onye-nwe-ayi ka o guzozie ike, dika Aisaia onye-amuma kwuru.

24. Ma ufọdu nime ha ka ezitereri site n'etiti ndi-Farisi.

25. Ha we jua ya, si ya, Ọ̀ bu kwa gini mere i nēme baptism, ma ọ buru na gi onwe-gi abughi Kraist ahu, ma i bughi Elaija, ma i bughi onye-amuma ahu?

26. Jọn zara ha, si, Mu onwem nēji miri me baptism: n'etiti unu ka otù Onye nēguzo Nke unu onwe-unu nāmataghi,

27. bú Onye ahu Nke nābia n'azum, Onye mu onwem nēkwesighi itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya.

28. Emere ihe ndia na Betani n'ofè Jọdan, ebe Jọn nēme baptism.

29. N'echi-ya ọ hu Jisus ka Ọ nābiakute ya, o we si, Le, Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa!

30. Onye a bu Onye mu onwem kwuru okwu bayere Ya, si, Otù Nwoke nābia n'azum Onye ghọworo Onye burum uzọ: n'ihi na Ọ buri Onye mbu n'ebe m'nọ.

31. Mu onwem amaghi kwa Ya; ma ka eme Ya ka Ọ puta ìhè nye Israel, n'ihi nka ka mu onwem biara nēji miri eme baptism.

32. Jọn we b͕a àmà, si, Ekiriwom Mọ Nsọ ka O si n'elu-igwe nēfeda ka nduru; O we nọgide n'aru Ya.

33. Mu onwem amaghi kwa Ya: ma Onye ziterem ka m'were miri me baptism, Onye ahu sirim, Onye ọ bula i gāhu Mọ Nsọ ka Ọ nēfedakwasi Ya, nānọgide kwa n'aru Ya, Onye ahu bu Onye nēji Mọ Nsọ eme baptism.

34. Mu onwem ahuwo kwa, b͕a kwa àmà na Onye a bu Ọkpara Chineke.

35. Ọzọ n'echi-ya Jọn guzoro, ya na madu abua nime ndi nēso uzọ-ya;

Jọn 1