Job 42:9-16 Bible Nso (IGBOB)

9. Elifaz, bú onye Timan, na Bildad, bú onye Shua, na Zofa, bú onye Neama, we je, me dika Jehova gwara ha: Jehova we hu Job iru-ọma.

10. Jehova me-kwa-ra ka ndọta-n'agha Job lata, mb͕e o kpere ekpere bayere ndi-eyì-ya: Jehova we tukwasi n'ihe nile Job nwere okpùkpù abua.

11. Umu-nne-ya ndikom nile, na umu-nne-ya ndinyom nile, na ndi nile mara ya na mb͕e gara aga, we biakute ya, so ya rie nri n'ulo-ya: ha we gosi ya ebere ha ji n'aru ya, kasi kwa ya obi bayere ihe ọjọ ahu nile nke Jehova mere ka ọ biakwasi ya: ha we nye ya, nwoke ọ bula otù iberibe ego, na nwoke ọ bula otù nb͕a-aka ọla-edo.

12. Ọzọ, Jehova gọziri ikpe-zu Job kari nmalite-ya, o we nwe orú nnù ewu na aturu na nnù iri-na-ise, na nnù camel iri-na-ise, na nnù ehi ise ejikọrọ abua abua, na nnù nne-inyinya-ibu abua na ọgu iri.

13. O nwe-kwa-ra umu-ndikom asa na umu-ndinyom atọ.

14. O we kpọ aha nwayi mbu, Jemaima; na aha nwayi nke-abua, Kezaia; na aha nwayi nke-atọ, Keren-hapuk.

15. Ma ahughi ndinyom, mara nma dika umu-ndinyom Job n'ala ahu nile: nna-ha we nye ha ihe-nketa n'etiti umu-nne-ha ndikom.

16. Job we di ndu mb͕e ihe a gasiri ọgu arọ asa, o we hu umu-ya, na umu umu-ya, bú ọb͕ọ anọ.

Job 42