Job 42:13-17 Bible Nso (IGBOB)

13. O nwe-kwa-ra umu-ndikom asa na umu-ndinyom atọ.

14. O we kpọ aha nwayi mbu, Jemaima; na aha nwayi nke-abua, Kezaia; na aha nwayi nke-atọ, Keren-hapuk.

15. Ma ahughi ndinyom, mara nma dika umu-ndinyom Job n'ala ahu nile: nna-ha we nye ha ihe-nketa n'etiti umu-nne-ha ndikom.

16. Job we di ndu mb͕e ihe a gasiri ọgu arọ asa, o we hu umu-ya, na umu umu-ya, bú ọb͕ọ anọ.

17. Job we nwua, buru agadi, ubọchi ndu-ya ju-kwa-ra ya afọ.

Job 42