Job 42:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Job we za Jehova, si,

2. Amawom na I puru ime ihe nile,Amawokwam na adighi-eb͕ochi nzube ọ bula nke sitere na Gi.

3. Ònye bu onye a nke nēzobe ndum-ọdu n'enweghi ọmuma-ihe?N'ihi ya ka m'gosiworo ihe nke m'nādighi-aghọta,Ihe dikaririm ebube, nke m'nādighi-amata.

4. Biko, nuru, mu onwem gēkwu kwa;M'gāju Gi, Gi me kwa ka m'mara.

5. Site n'ọnunu nti ka m'nuru Gi;Ma ub͕u a anyam ahuwo Gi.

6. N'ihi nka ka m'nāju onwem aju, we chèghariaN'elu ájá na ntu.

7. O rue, mb͕e Jehova gwasiri Job okwu ndia, na Jehova siri Elifaz, bú onye Timan, Iwem di ọku megide gi, megide kwa ndi-eyì-gi abua: n'ihi na unu ekwughi ihe ziri ezi bayerem, dika orùm, bú Job, kwuworo.

Job 42