1. Ma ub͕u a ha achìwom ọchì, bú ndi bu nwata karim,Ndi m'juru ido ndi bu nna-ha n'etiti nkita nke ìgwè ewu na aturu nkem.
2. Ọzọ, ike aka-ha, gini ka ọ gābaram?Ndi ike nke agadi-ha laworo n'iyì.
3. N'ihi ihe-ukọ na n'ihi agu ha bu ndi nēnweghi ike imu nwa:Ha bu ndi nēwere ezé-ha kọ̀cha ala ọkpọ-nku, nke bu nkpọnkpọ ebe na ebe tọb͕ọrọ n'efu na mb͕e gara aga.
4. Ndi nānyajipu mallow n'akuku umu-osisi;Nkpọrọgwu osisi broom bu kwa nri-ha.
5. Anēsi n'etiti madu chupu ha;Ha nētiso ha nkpu dika anētiso onye-ori.
6. N'ebe nākpata ima-jijiji nke ndagwurugwu ka ha nāghaghi ibi,Bú ọnu atùru n'ájá na n'oké nkume.
7. N'etiti umu-osisi ka ha nēti nkpu dika inyinya-ibu;N'okpuru akuba ka ha nējikọta onwe-ha.
8. Ha bu umu ndi-nzuzu, e, umu nke ndi nēnweghi aha;Apiapuwo ha n'ala.
9. Ma ub͕u a aghọwom abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara,M'bu-kwa-ra ha okwu ha nēkwughari.
10. Ha nākpọm ihe-árú, ha nọ n'ebe di anya site n'ebe m'nọ,Ha eb͕ochighi kwa onwe-ha n'ibu ọnu-miri n'irum.
11. N'ihi na Ọ tọpuwo udọ̀-Ya, we wedam n'ala,Ha achipuwo kwa bridle n'irum.
12. N'aka-nrim ka ab͕ọ ahu nēbili;Ukwum abua ka ha nupuworo,We tulie uzọ nhuju-anya-ha megidem.
13. Ha emebiwo uzọm,Ha bara nmebim urù,Bú ndi nēnweghi onye nēyere ha aka.
14. Dika ọ bu na nitpú sara mbara, otú a ka ha nābia:N'okpuru ntikpọ ahu ka ha turuworo onwe-ha n'arum.