1. Mb͕e ihe a gasiri, Job saghere ọnu-ya, kọcha ubọchi-ya.
2. Job we za, si:
3. Ka ubọchi nke amurum nime ya la n'iyì,Ya na abali ahu nke siri, Aturu ime nwa-nwoke.
4. Ka ubọchi ahu ghọ ọchichiri;Ka Chineke ghara isi n'elu ju ase ya,Ka ìhè ghara kwa imukwasi ya.
5. Ka ọchichiri na onyinyo ọnwu b͕aputa ya;Ka igwe-oji biri n'elu ya;Ka ihe nile nke nēme ka ubọchi b͕a ọchichiri me ka ọ tua egwu nke-uku.
6. Abali ahu, ka oké ọchichiri jide ya:Ka ọ ghara iṅuri ọṅu n'etiti ubọchi nile nke arọ;Ka ọ ghara ibata n'ọnu-ọgugu ọnwa.
7. Le, ka abali ahu ghọ nwayi-àgà;Ka iti-nkpu-ọṅù ghara ibà nime ya.
8. Ka ha bua ya ọnu, bú ndi nābu ubọchi ọnu,Ndi nọ na njikere ikpọte leviathan.
9. Ka kpakpando nile nke emumechi-ya b͕a ọchichiri:Ka ọ le anya ìhè, ìhè adighi kwa;Ka ọ ghara ile mbuboro-anya nke chi-ọbubọ anya: