Job 14:18-21 Bible Nso (IGBOB)

18. Ma otú ọ di, ugwu nke nāda ada nāla n'iyì,Anākwapu kwa oké nkume n'ọnọdu ya.

19. Miri nēme ka nkume ta;Orúrú-ya nāṅachapu ájá ala:Olile-anya madu ka I mewo-kwa-ra ka ọ la n'iyì.

20. I nwere ike n'aru ya rue mb͕e ebighi-ebi, ọ we la;I nēme ka iru-ya b͕anwe, I we zilaga ya.

21. Anāsọpuru umu-ya ndikom, ma ọ dighi-ama ya;Ha nāghọ kwa ndi ntà, ma ọ dighi-amata ihe bayere ha.

Job 14