14. Ọ buru na madu anwua, ọ̀ gadi ndu ọzọ?Ubọchi nile nke obubu-agham ka m'gēche,Rue mb͕e nb͕anwem gābia.
15. I gākpọ òkù, mu onwem gāza kwa Gi:Agu ọlu aka-Gi gāgu Gi.
16. N'ihi na ubu a I nāgu nzọ-ukwum ọnu:Ì dighi-elezi nmehiem anya?
17. Akachiwo njehiem akàrà n'àkpà,I we tekpue ajọ omumem ihe.
18. Ma otú ọ di, ugwu nke nāda ada nāla n'iyì,Anākwapu kwa oké nkume n'ọnọdu ya.
19. Miri nēme ka nkume ta;Orúrú-ya nāṅachapu ájá ala:Olile-anya madu ka I mewo-kwa-ra ka ọ la n'iyì.
20. I nwere ike n'aru ya rue mb͕e ebighi-ebi, ọ we la;I nēme ka iru-ya b͕anwe, I we zilaga ya.
21. Anāsọpuru umu-ya ndikom, ma ọ dighi-ama ya;Ha nāghọ kwa ndi ntà, ma ọ dighi-amata ihe bayere ha.