6. Ulo-ikwū nile nke ndi nāpunara madu ihe di n'udo,Ntukwasi-obi di-kwa-ra ndi nākpasu Chineke iwe;Bú onye ọ bula nke wetaworo chi-ya n'aka-ya.
7. Ma otú ọ di, biko, jua anumanu, ha gēzí kwa gi ihe,Na anu-ufe nke elu-igwe, ha gēgosi kwa gi:
8. Ma-ọbu gi na uwa kparita uka, o gēzí kwa gi ihe;Azù nke oké osimiri gākọ-kwa-ra gi.
9. Ọ̀ bu onye nāmaghi n'ihe ndia nile,Na aka Jehova emewo nka?
10. Onye nkpuru-obi nke ihe ọ bula di ndu di n'aka-Ya,Ya na mọ nke anu-aru nile nke madu.
11. Nti, ọ̀ dighi-anwa okwu?Okpo-ọnu kwa, ọ̀ dighi-edeturu onwe-ya ihe-oriri-ya?
12. Nime ndi kara nká ka amam-ihe di,N'ubọchi ndu di ogologo ka nghọta di kwa.
13. N'aka-Ya ka amam-ihe na idi-ike di;Ọ nwere ndum-ọdu na nghọta.
14. Le, Ọ nākwada ihe, agaghi-ewu kwa ya ọzọ;Ọ nēmechibido madu uzọ, agaghi-emeghe kwa ya.
15. Le, Ọ nēb͕ochi miri, ha takọrọ;Ọzọ, ọ nēzipu ha, ha we kpùe uwa iru.
16. N'aka-Ya ka ike na nzube-ihe di;O nwere onye nēmehie n'amaghi-ama na onye nēme ka madu mehie n'amaghi-ama.
17. Ọ nēme ka ndi nādu ọdu la dika onye akwatara ihe-ya n'agha,Ọ nēme kwa ndi-ikpe ka ha ghọ ndi-nzuzu.