Job 12:4-21 Bible Nso (IGBOB)

4. Onye bu ihe-ọchì nke madu-ibe-ya ka m'bu,Bú onye nākpọku Chineke, O we za ya:Ihe-ọchì ka onye ezi omume nke zuru okè bu.

5. Nleda diri ọdida n'èchìchè onye nọ jū;Edoziwo ya nye ndi ukwu-ha nāb͕uchapu ab͕uchapu.

6. Ulo-ikwū nile nke ndi nāpunara madu ihe di n'udo,Ntukwasi-obi di-kwa-ra ndi nākpasu Chineke iwe;Bú onye ọ bula nke wetaworo chi-ya n'aka-ya.

7. Ma otú ọ di, biko, jua anumanu, ha gēzí kwa gi ihe,Na anu-ufe nke elu-igwe, ha gēgosi kwa gi:

8. Ma-ọbu gi na uwa kparita uka, o gēzí kwa gi ihe;Azù nke oké osimiri gākọ-kwa-ra gi.

9. Ọ̀ bu onye nāmaghi n'ihe ndia nile,Na aka Jehova emewo nka?

10. Onye nkpuru-obi nke ihe ọ bula di ndu di n'aka-Ya,Ya na mọ nke anu-aru nile nke madu.

11. Nti, ọ̀ dighi-anwa okwu?Okpo-ọnu kwa, ọ̀ dighi-edeturu onwe-ya ihe-oriri-ya?

12. Nime ndi kara nká ka amam-ihe di,N'ubọchi ndu di ogologo ka nghọta di kwa.

13. N'aka-Ya ka amam-ihe na idi-ike di;Ọ nwere ndum-ọdu na nghọta.

14. Le, Ọ nākwada ihe, agaghi-ewu kwa ya ọzọ;Ọ nēmechibido madu uzọ, agaghi-emeghe kwa ya.

15. Le, Ọ nēb͕ochi miri, ha takọrọ;Ọzọ, ọ nēzipu ha, ha we kpùe uwa iru.

16. N'aka-Ya ka ike na nzube-ihe di;O nwere onye nēmehie n'amaghi-ama na onye nēme ka madu mehie n'amaghi-ama.

17. Ọ nēme ka ndi nādu ọdu la dika onye akwatara ihe-ya n'agha,Ọ nēme kwa ndi-ikpe ka ha ghọ ndi-nzuzu.

18. Ab͕u ndi-eze kere ka Ọ tọpuworo,We ke ihe-ọkiké n'úkwù-ha.

19. Ọ nēme ka ndi-nchu-àjà la dika onye akwatara ihe-ya nagha,Ndi nādigide ka Ọ nēme kwa ka ha kpùe iru.

20. Ọ nēwezuga okwu eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi kwesiri ntukwasi-obi,Ezi uche nke ndi-okenye ka Ọ nēwepu kwa.

21. Ọ nāwusa nleda n'aru ndi amara aha-ha,Akpukpọ-úkwù nke ndi di ike ka Ọ kpọpu-kwa-ra.

Job 12