Job 12:13-25 Bible Nso (IGBOB)

13. N'aka-Ya ka amam-ihe na idi-ike di;Ọ nwere ndum-ọdu na nghọta.

14. Le, Ọ nākwada ihe, agaghi-ewu kwa ya ọzọ;Ọ nēmechibido madu uzọ, agaghi-emeghe kwa ya.

15. Le, Ọ nēb͕ochi miri, ha takọrọ;Ọzọ, ọ nēzipu ha, ha we kpùe uwa iru.

16. N'aka-Ya ka ike na nzube-ihe di;O nwere onye nēmehie n'amaghi-ama na onye nēme ka madu mehie n'amaghi-ama.

17. Ọ nēme ka ndi nādu ọdu la dika onye akwatara ihe-ya n'agha,Ọ nēme kwa ndi-ikpe ka ha ghọ ndi-nzuzu.

18. Ab͕u ndi-eze kere ka Ọ tọpuworo,We ke ihe-ọkiké n'úkwù-ha.

19. Ọ nēme ka ndi-nchu-àjà la dika onye akwatara ihe-ya nagha,Ndi nādigide ka Ọ nēme kwa ka ha kpùe iru.

20. Ọ nēwezuga okwu eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi kwesiri ntukwasi-obi,Ezi uche nke ndi-okenye ka Ọ nēwepu kwa.

21. Ọ nāwusa nleda n'aru ndi amara aha-ha,Akpukpọ-úkwù nke ndi di ike ka Ọ kpọpu-kwa-ra.

22. Ọ nēsi n'ọchichiri kpughepu ihe di omimi,We me ka onyinyo ọnwu puta ìhè.

23. Ọ nēme ka mba di uku, Ọ nēme kwa ka ha la n'iyì:Ọ nāb͕asa mba, nēdu kwa ha.

24. Ọ nēwezuga obi ndi-isi nke ndi uwa,We me ka ha waghari n'ebe tọb͕ọrọ n'efu ebe uzọ nādighi.

25. Ha nāsọghari ìsì n'ọchichiri nēnweghi ìhè,O we me ka ha kpafue dika onye ṅubigaworo manya ókè.

Job 12