10. Ọ buru na Ọ ga n'iru, mechibido madu uzọ,Kpọkọta nkpọkọta, ònye gēme kwa ka Ọ laghachi?
11. N'ihi na Ya onwe-ya mara madu efu:Ọ nāhu kwa ajọ ihe, mb͕e Ọ nādighi-elegide ya anya.
12. Ma nkpọkọrọ madu gēnwe obi,Mb͕e amuru nwa-inyinya-ibu-ọhia ka ọ buru madu.
13. Ọ buru na gi onwe-gi edozie obi-gi,We b͕asa ọbu-aka-gi abua n'ebe Ọ nọ;
14. Ọ buru na ajọ ihe adi n'aka-gi, me ka ọ di n'ebe di anya,Ekwe-kwa-la ka ajọ omume biri nulo-ikwū-gi nile;
15. N'ihi na mb͕e ahu i gēweli iru-gi nēnweghi ọlu n'aru-gi;I gābu kwa ihe siri ike dika ọla awuru awu, i gaghi-atu kwa egwu: