36. N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Le, M'gaje ikpe ọnu-gi, bọ̀ ọ́bọ̀-gi; M'gēme kwa ka oké osimiri-ya tasia, me kwa ka isi-iyi-ya takọrọ.
37. Babilon gāghọ kwa nání obo-ihe obo-ihe, ebe-obibi nkita-ọhia, na ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, ghara inwe onye-obibi.
38. N'otù ka ha gāb͕ọ uja dika umu-ọdum; ha edekpọwo dika umu-ọdum nāṅu ara.
39. N'okpom-ọku-ha ka M'gēme ọṅuṅu-manya nile ha, mee ka ha ṅubiga manya ókè, ka ha we ṅuria ọṅu-agha, raru ura ebighi-ebi, ghara iteta; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
40. M'gēme ka ha rida dika umu-aturu ka ewe b͕ue ha, dika ebulu, ha na nkpi.
41. Le, ka esiworo were Shishak! le, ka esiworo jide otuto uwa nile! le, ka Babilon siworo ghọ ihe-iju-anya n'etiti mba nile!
42. Oké osimiri erukpuwo Babilon: ejiwo nkpọtu nmali-miri-ya nile kpuchie ya.
43. Obodo-ya nile aghọwo ihe-iju-anya, na ala kpọrọ nku, na ala ihe nādighi, bú ala nke ọ nādighi onye ọ bula nēbi nime ha, nwa madu ọ bula adighi-agabiga kwa nime ha.
44. M'gēji kwa nmehie-ya leta Bel nime Babilon, M'gēme kwa ka ihe o loworo si n'ọnu-ya puta; mba di iche iche agaghi-erùkuru kwa ya ọzọ dika miri: ọzọ mb͕idi Babilon gāda.
45. Sinu n'etiti ya pua, unu ndim, wepuganu onwe-unu n'otù n'otù n'iwe di ọku nke Jehova.
46. Lezi-kwa-nu anya ka obi-unu ghara ilọ unu miri, ka unu ghara itu egwu n'ihi akukọ ahu nke anānu n'ala ahu; n'ihi na akukọ ahu gābia n'otù arọ, emesia n'arọ ọzọ akukọ ahu gābia kwa, ihe-ike gādi kwa n'ala ahu, onye nāchi achi nēmegide onye nāchi achi.
47. N'ihi nka, le, ubọchi nābia, mb͕e M'gēji nmehie-ha leta arusi nile apiri apiri nke Babilon, ihere gēme kwa ala-ya nile; ndi-ya nile eb͕uru eb͕u gāda kwa n'etiti ya.
48. Elu-igwe na uwa na ihe nile nke di nime ha ewe tie nkpu ọṅù bayere Babilon; n'ihi na ndi nāpunara ya ihe gēsi n'Ugwu biarue ya aru; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
49. Ọbuná Babilon aghaghi ida, unu ndi eb͕uru eb͕u nke Israel, ọ bu kwa na Babilon ka ndi ala ahu nile eb͕uru eb͕u gāda.
50. Unu ndi b͕apuworo na mma-agha, jenu, unu eguzola; chetanu Jehova site n'ebe di anya, ka Jerusalem bata kwa n'obi-unu.
51. Ihere emewo ayi, n'ihi na ayi anuwo ita-uta; ọnọdu-ihere etiyere ayi nime ya ekpuchiwo ayi n'iru: n'ihi na ndi ala ọzọ abàwo imegide ebe nsọ nile nke ulo Jehova.
52. N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēji nmehie-ha leta arusi-ya nile apiri api; ọ bu kwa n'ala-ya nile ka ndi emeruworo aru gāsu udè.
53. Asi na Babilon arigorue elu-igwe, asi kwa na o wusie ebe di elu nke ike-ya ike, ma na Mu ka ndi nāpunara ya ihe gēsi biarue ya aru; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
54. Ge nti olu iti-nkpu sitere na Babilon, na olu ntipia uku sitere n'ala ndi Kaldea!
55. n'ihi na Jehova nāpunara Babilon ihe-ya, Ọ nēme kwa ka oké olu si nime ya la n'iyì; nmali-miri nile ha we bib͕ọ dika ọtutu miri, nkpọtu nke olu-ha akpọtuwo: