Jeremaia 49:22-31 Bible Nso (IGBOB)

22. Le, dika ugo ka ọ gārigo, fesie ike, b͕asa nkù-ya n'elu Bọzra: obi ndi-dike Edom n'ubọchi ahu gādi kwa ka obi nwanyi ime nēme.

23. Nke diri Damaskọs. Ihere emewo Hemat na Apad; n'ihi na akukọ ọjọ ka ha nuworo, ha ab͕azewo: n'oké osimiri ka ncheb͕u di; ọ pughi inọ jū.

24. Damaskọs aghọwọ onye-ume-ngwu, o lewo anya n'azu ib͕alaga, ọma-jijiji ejidewo kwa ya: nkpà na ihe-nb͕u di iche iche ejidesiwo kwa ya ike, dika nke nwanyi ime nēme.

25. Èsi aṅa ghara irapu obodo nke otuto, bú obodo nke obi-utọm?

26. N'ihi nka ka umu-okorọbia-ya gāda n'amá-ya nile, ọ bu kwa ndi-agha-ya nile ka agēme ka ha dere du n'ubọchi ahu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

27. M'gēsuye kwa ọku na mb͕idi Damaskọs, ọ gēripia kwa ulo nile di elu nke Ben-hedad.

28. Nke diri Kida, di-kwa-ra ala-eze nile nke Hezoa, nke Nebukadreza, bú eze Babilon, tib͕uru.Otú a ka Jehova siri: Bilienu, rigorue Kida, punara umu Iru-anyanwu ihe-ha.

29. Ulo-ikwū nile ha na ìgwè ewu na aturu-ha ka ha gāchiri; ákwà-nkwuba nile ha na ihe nile ha na camel nile ha ka ha gēbupuru onwe-ha: ha gākpọ nkpu bayere ha, si, Ujọ di buruburu.

30. B͕alaganu, wagharia nke-uku, biri n'ebe di omimi, unu ndi bi na Hezoa, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); n'ihi na Nebukadreza, bú eze Babilon, aduwo ọdu megide unu, ọ chèwo kwa èchìchè megide unu.

31. Bilienu, rigorue mba nke nọ n'udo, nke bi na ntukwasi-obi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); nke nēnweghi ọnu-uzọ ma-ọbu ihe-ntuchi, nání ha nēbi.

Jeremaia 49