18. Si na nsọpuru-gi rida, nọdu ala n'akpiri-ikpọ-nku, gi ada nke bi na Dibon; n'ihi na onye nāpunara Moab ihe-ya arigowo imegide gi, o biliwo ebe-gi nile ewusiri ike.
19. Guzo n'uzọ, che nche, gi nwanyi bi n'Aroa: jua onye nāb͕alaga na nwanyi nke nēwepuga onwe-ya; si, Gini mere?
20. Emewo ka ihere me Moab; n'ihi na ọ tuwo ujọ: kwasie ákwá ike ti kwa nkpu; gosinu ya n'Anon, na emebiwo Moab.
21. Ikpé abiaruwo kwa ala nke bu ala di lari; rue Holon, ru kwa Jahza, ọ biakwasiwo kwa Mefaat;
22. biakwasi kwa Dibon, biakwasi kwa Nebo, biakwasi kwa Bet-diblataim;
23. biakwasi kwa Kiriataim, biakwasi kwa Bet-gamul, biakwasi kwa Bet-meon;
24. biakwasi kwa Keriot, biakwasi kwa Bọzra, biakwasi kwa obodo nile nke ala Moab, nke di anya ma-ọbu nke di nso.
25. Ebipuwo mpi Moab, ab͕ajiwo kwa ogwe-aka-ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta).
26. Menu ya ka ọ ṅubiga manya ókè; n'ihi na ọ bu Jehova ka o mere onwe-ya ka ọ di uku megide: Moab gāturu kwa onwe-ya n'ihe ọ b͕ọrọ, ọ gāghọ kwa ihe-ọchì, ọbuná ya onwe-ya.
27. N'ihi na Israel, ọ̀ bughi ihe-ọchì ọ buru gi? ọ̀ bu n'etiti ndi-ori ka achọtara ya? n'ihi na ka mb͕e ra i nēkwu okwu bayere ya, i nēfufe isi-gi.
28. Rapunu obodo nile, we biri na nkume di elu, unu ndi bi na Moab; di-kwa-nu ka nduru nke nālu akwu-ya n'ofè ọnu olùlù.
29. Ayi anuwo ihe bayere npako Moab, na ọ nāpako npako nke-uku; ọbuná ihe bayere idi-elu-ya, na npako-ya, na nganga-ya, na nbuli-elu nke obi-ya.