Jeremaia 36:10-29 Bible Nso (IGBOB)

10. Beruk we gua n'akwukwọ ahu okwu nile nke Jeremaia n'ulo Jehova, n'ime-ulo Gemaraia nwa Shefan, bú ode-akwukwọ, n'ogige nke di n'elu, n'oghere ọnu-uzọ-ama ọhu nke ulo Jehova, na nti ndi Israel nile.

11. Maikaia nwa Gemaraia, nwa Shefan, we nuru okwu nile nke Jehova nke sitere n'akwukwọ ahu,

12. o we rida n'ulo eze, rue ime-ulo nke ode-akwukwọ: ma, le, n'ebe ahu ka ndi-isi nile nānọdu, bú Elishama ode-akwukwọ, na Delaia nwa Shemaia, na Elnetan nwa Akboa, na Gemaraia nwa Shefan, na Zedekaia nwa Hananaia, na ndi-isi nile.

13. Maikaia we gosi ha okwu nile ọ nuru, mb͕e Beruk nāgu akwukwọ ahu na nti ndi Israel nile.

14. Ndi-isi nile we zìe Jehudi nwa Netanaia, nwa Shelemaia, nwa Kushi, jekuru Beruk, si, Akwukwọ-npiakọta ahu nke iguworo ihe nime ya na nti ndi Israel, were n'aka-gi bia. Beruk nwa Neraia we were akwukwọ-npiakọta ahu n'aka-ya, biakute ha.

15. Ha we si ya, Biko, nọdu ala, gua ya na nti-ayi. Beruk we gua ya na nti-ha.

16. O rue, mb͕e ha nusiri okwu ndia nile, na ha turu oké egwu, onye na ibe-ya, ha we si Beruk, Ayi aghaghi igosi eze okwu ndia nile.

17. Ha we jua Beruk, si, Biko, gosi ayi, Ì siri aṅa deputa okwu ndia nile n'ọnu-ya?

18. Beruk we si ha, N'ọnu-ya ka ọ nākpọrọm okwu ndia nile, ma mu onwem were ink ede ha n'akwukwọ a.

19. Ndi-isi we si Beruk, Je, zobe onwe-gi, gi onwe-gi na Jeremaia; ekwe-kwa-la onye ọ bula mara ebe unu onwe-unu nọ.

20. Ha we bakuru eze n'ogige; ma ha debereri akwukwọ-npiakọta ahu n'ime-ulo Elishama, bú ode-akwukwọ; ha we gosi okwu nile na nti abua nke eze.

21. Eze we ziga Jehudi iweta akwukwọ-npiakọta ahu: o we weputa ya n'ime-ulo Elishama, bú ode-akwukwọ. Jehudi we gua ya na nti abua nke eze, na na nti ndi-isi nile ndi nēguzo n'akuku eze.

22. Ma eze nānọdu n'ulo mb͕e oyi n'ọnwa nke-iteghete: ọku nēnwu kwa n'ite-ọku nke di n'iru ya.

23. O rue, mb͕e Jehudi gusiri ibe akwukwọ atọ ma-ọbu anọ, na o ji mma ode-akwukwọ bìkasia ya, tubà ya n'ọku nke di n'ite-ọku, rue mb͕e akwukwọ-npiakọta ahu resiri n'ọku nke di n'ite-ọku.

24. Ma ha atughi oké egwu, ha adọwaghi kwa uwe-ha, bú eze na ndi-orù-ya nile ndi nānu okwu ndia nile.

25. Ọzọ kwa, Elnetan na Delaia na Gemaraia riọrọri eze arìriọ ka ọ ghara isure akwukwọ-npiakọta ahu: ma o geghi ha nti.

26. Eze we nye Jeramil nwa eze na Seraia nwa Azriel na Shelemaia nwa Abdeel iwu iwere Beruk, bú ode-akwukwọ, Jeremaia, bú onye-amuma: ma Jehova zobere ha.

27. Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, mb͕e eze suresiri akwukwọ-npiakọta ahu, na okwu nile nke Beruk deputara n'ọnu Jeremaia, si,

28. Were kwa n'onwe-gi akwukwọ-npiakọta ọzọ, dekwasi na ya okwu mbu nile nke di n'elu akwukwọ-npiakọta mbu, nke Jehoiakim, bú eze Juda, sureworo ọku.

29. Ma i gēkwu okwu bayere Jehoiakim, bú eze Juda, si, Otú a ka Jehova siri: Gi onwe-gi esurewo akwukwọ-npiakọta nka ọku, si, Gini mere i ji dekwasi n'akwukwọ a, si, Eze Babilon aghaghi ibia bibie ala nka, me ka madu na anumanu kwusi nime ya?

Jeremaia 36