Jeremaia 22:6-14 Bible Nso (IGBOB)

6. N'ihi na ihe di otú a ka Jehova kwuru bayere ulo eze Juda, si: Gilead ka i burum, bú isi Lebanon: ma aghaghm ime gi ka i ghọ ọzara, na obodo nke madu nēbighi.

7. M'gēdo kwa ndi-nbibi nsọ imegide gi, onye ọ bula na ihe-agha-ya: ha gēb͕utu kwa osisi cedar gi nile kachasi nma, me ka ha dakwasi n'ọku.

8. Ọtutu mba gāgabiga kwa n'akuku obodo a, ha gāsirita kwa ibe-ha n'otù n'otù, N'ìhi gini ka Jehova meworo obodo uku a otú a?

9. Ha gāsi kwa, Ọ bu n'ihi na ha rapuru ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-ha, we kpọ isi ala nye chi ọzọ di iche iche, fè ha.

10. Unu akwalara onye nwuru anwu ákwá, unu egosi-kwa-la ya ebere unu nwere n'aru ya: kwasierenu onye-ije ahu ike; n'ihi na ọ gaghi-alata kwa ọzọ, ọ gaghi-ahu kwa ala amuru ya ọzọ.

11. N'ihi na okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere Shalum nwa Josaia, bú eze Juda, nke bu eze n'ọnọdu Josaia, bú nna-ya, nke siri n'ebe a pua, si: Ọ gaghi-alata kwa n'ebe ahu ọzọ;

12. kama n'ebe ahu nke ha mere ya ka ọ je biri, n'ebe ahu ka ọ gānwu, ma ala nka ka ọ nāgaghi-ahu kwa ọzọ.

13. Ahuhu gādiri onye ji ajọ omume ewu ulo-ya, nke ji kwa ikpé nēzighi ezi ewu ime-elu-ya nile; nke nēme ka madu-ibe-ya fè òfùfè n'efu, ọ dighi-enye kwa ya ugwọ-ọlu-ya;

14. onye nāsi, M'gēwuru onwem ulo uku na ime-ulo-elu di iche iche sara mbara, onye nēmere onwe-ya ka window-ya sa mbara; eji kwa osisi cedar machita elu-ya, eji kwa ihe-otite nācha uhie uhie te ya.

Jeremaia 22