Jeremaia 10:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Nurunu okwu Jehova gwaworo unu, unu ulo Israel:

2. Otú a ka Jehova siri, Unu amutala uzọ mba nile, unu atu-kwa-la ujọ ihe-iriba-ama di iche iche nke elu-igwe; n'ihi na mba nile nātu ujọ ha.

3. N'ihi na ukpuru nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu: n'ihi na ọ bu nání osisi, nke madu b͕utuworo, ọlu aka abua nke onye-ọ̀kà ji anyu-ike alu ọlu.

4. Ha ji ọla-ọcha, ji kwa ọla-edo, eme ya ka ọ ma nma; ha ji ǹtú, ji kwa otùtù, eme ya ka o sie ike, ka ọ we ghara isu ngọngọ.

5. Ha di ka nkwu, ihe akpuru akpu ka ha bu, ha adighi-ekwu okwu: aghaghi ibu ha ebu, n'ihi na ha adighi-azọ ije. Unu atula egwu ha; n'ihi na ha agaghi-eme ihe ọjọ, ọzọ kwa, ime izi ihe adighi ha n'aka.

6. Ọ dighi nke di ka Gi ma-ọli, Jehova; Onye uku ka I bu, ihe di uku ka aha-Gi di kwa n'idi-ike.

7. Ònye nāgaghi-atu egwu Gi, Eze mba nile? n'ihi na Gi ka o kwesiri: n'ihi na n'etiti ndi-amam-ihe nile nke mba nile, na n'ala-eze nile ha, ọ dighi onye di ka Gi ma-ọli.

8. Ma ha nile n'otù bu anu-ọhia na ndi-nzuzu: idọ-aka-na-nti nke ihe-efu, nání osisi ka ọ bu.

9. Ọla-ọcha di nke etisaworo mbadamba nke anēsi na Tashish weta, na ọla-edo nke sitere n'Ufaz, bú ọlu onye-ọ̀kà na nke aka onye-nnucha-ọla: ákwà anunu na ákwà ododo bu uwe-oyiyi-ha; ọlu nke ndi mara ihe ka ha nile bu.

Jeremaia 10