9. Nwa-ọdum ka Juda bu;N'anu adọb͕uru, nwam, ka i siworo rigo;O ruru ala, ọ makpuru dika ọdum,Na dika nne-ọdum; ònye gēme ka o bilie?
10. Nkpa-n'aka eze agaghi-esi n'ebe Juda nọ wezuga onwe-ya,Nkpa-n'aka onye nēnye ukpuru agaghi-esi kwa n'etiti ukwu-ya abua wezuga onwe-ya,Rue mb͕e Shailo gābia;Ọ bu kwa ya gēnwe iṅa-nti ndi di iche iche.
11. O nēlibe nwa-inyinya-ibu-ya n'osisi vine,O nēlibe kwa nwa nke nne-inyinya-ibu-ya n'osisi vine kachasi nma;Ọ suworo uwe-ya nime manya-vine,Su kwa ákwà-nb͕okwasi-ya n'ọbara nkpuru-vine:
12. Anya-ya abua nācha ọbara-ọbara site na manya-vine,Ezé-ya nēnwu kwa ọcha site na miri-ara-ehi.
13. Zebulun, n'ọnu-miri nke oké osimiri ka o gēbi:Ya onwe-ya gānọ kwa n'ọnu-miri nke ub͕o.Akuku-ya gādi kwa n'akuku Zaidon.
14. Isaka bu inyinya-ibu di ike,Nāmakpuru n'etiti ogige-aturu abua:
15. Ọ we hu izu-ike, na ọ di nma,Hu kwa ala ahu, na ọ di uto;Ọ we chebe ubu-ya ibu ibu,We ghọ onye nēfè òfùfè orù.
16. Dan gēkpeputa ndi-ya,Dika otù nime ebo nile nke Israel.
17. Ka Dan buru agwọ n'uzọ,Aju-ala n'okporo-uzọ,Nke nāta ikiri-ukwu inyinya aru,Onye o nēbu we daghachi azu.