Jenesis 49:8-12 Bible Nso (IGBOB)

8. Juda, gi onwe-gi, umu-nne-gi gēkele gi:Aka-gi di n'olu ndi-iro-gi;Umu-ndikom nna-gi gākpọ isi ala nye gi.

9. Nwa-ọdum ka Juda bu;N'anu adọb͕uru, nwam, ka i siworo rigo;O ruru ala, ọ makpuru dika ọdum,Na dika nne-ọdum; ònye gēme ka o bilie?

10. Nkpa-n'aka eze agaghi-esi n'ebe Juda nọ wezuga onwe-ya,Nkpa-n'aka onye nēnye ukpuru agaghi-esi kwa n'etiti ukwu-ya abua wezuga onwe-ya,Rue mb͕e Shailo gābia;Ọ bu kwa ya gēnwe iṅa-nti ndi di iche iche.

11. O nēlibe nwa-inyinya-ibu-ya n'osisi vine,O nēlibe kwa nwa nke nne-inyinya-ibu-ya n'osisi vine kachasi nma;Ọ suworo uwe-ya nime manya-vine,Su kwa ákwà-nb͕okwasi-ya n'ọbara nkpuru-vine:

12. Anya-ya abua nācha ọbara-ọbara site na manya-vine,Ezé-ya nēnwu kwa ọcha site na miri-ara-ehi.

Jenesis 49