Jenesis 49:7-11 Bible Nso (IGBOB)

7. Ihe anābu ọnu ka iwe-ha bu, n'ihi na ọ di ike;Ọnuma-ha bu kwa ihe anābu ọnu, n'ihi na o sika ike:M'gēkesa ha nime Jekob,B͕asa kwa ha n'Israel.

8. Juda, gi onwe-gi, umu-nne-gi gēkele gi:Aka-gi di n'olu ndi-iro-gi;Umu-ndikom nna-gi gākpọ isi ala nye gi.

9. Nwa-ọdum ka Juda bu;N'anu adọb͕uru, nwam, ka i siworo rigo;O ruru ala, ọ makpuru dika ọdum,Na dika nne-ọdum; ònye gēme ka o bilie?

10. Nkpa-n'aka eze agaghi-esi n'ebe Juda nọ wezuga onwe-ya,Nkpa-n'aka onye nēnye ukpuru agaghi-esi kwa n'etiti ukwu-ya abua wezuga onwe-ya,Rue mb͕e Shailo gābia;Ọ bu kwa ya gēnwe iṅa-nti ndi di iche iche.

11. O nēlibe nwa-inyinya-ibu-ya n'osisi vine,O nēlibe kwa nwa nke nne-inyinya-ibu-ya n'osisi vine kachasi nma;Ọ suworo uwe-ya nime manya-vine,Su kwa ákwà-nb͕okwasi-ya n'ọbara nkpuru-vine:

Jenesis 49