Jenesis 44:2-15 Bible Nso (IGBOB)

2. Tiye kwa ọkwam, bú ọkwa ọla-ọcha, n'ọnu akpa onye nke-ntà, ya na ego ọka-ya. Ọ we me dika okwu Josef si di, nke o kwuru.

3. Mb͕e ìhè ututu putara, ewe zilaga ndikom ahu, ha na inyinya-ibu-ha.

4. Ndi ahu siri n'obodo pua, ha erughi n'ebe di anya, ma Josef siri onye bu onye-isi ulo-ya, Bilie, chua ndikom ahu; mb͕e i ruru ha aru i gāsi ha, N'ìhi gini ka unu were ihe ọjọ kwughachi n'ọnọdu ezi ihe?

5. Ọ̀ bughi nka bu ihe onye-nwem ji aṅu ihe-ọṅuṅu, ya onwe-ya ji kwa ya ariba ama n'ezie? unu emewo ihe ọjọ n'ihe nke unu mere.

6. Ọ we rue ha aru, gwa ha okwu ndia.

7. Ha si ya, N'ìhi gini ka onye-nwem nēkwu okwu dika okwu ndia? Ya buru ndi-orú-gi ihe-árú ime ihe dika ihe a.

8. Le, ego nke ayi hutara n'ọnu akpa-ayi, ayi si n'ala Kenean weghachiri gi ya: àyi gēsi kwa aṅa si n'ulo onye-nwe-gi zuru ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo?

9. Onye ọ bula n'etiti ndi-orù-gi agāchọta ya n'aka-ya, ya nwua, ọzọ kwa, ayi onwe-ayi gāghọrọ onye-nwem ndi-orù.

10. Ọ si, Ub͕u a kwa, dika okwu nile unu si di, otú a ka ọ gādi: onye agāchọta ya n'aka-ya gāburum orù; ma unu onwe-unu gābu ndi puru ya.

11. Ha we me ngwa, weda akpa-ha, onye ọ bula akpa nke ya, ha meghe akpa-ha, onye ọ bula akpa nke ya.

12. Ọ we chọsie ike, n'okenye ka ọ malitere, ọ bu kwa na nke-ntà ka ọ chọbiri: ewe chọta ọkwa ahu n'akpa Benjamin.

13. Ha we dọwa uwe-nb͕okwasi-ha, onye ọ bula o bo inyinya-ibu-ya ibu, ha we laghachi n'obodo.

14. Juda na umu-nne-ya we ba n'ulo Josef; ma ya onwe-ya nọ kwa n'ebe ahu rue mb͕e ahu: ha we da n'ala n'iru ya.

15. Josef we si ha, Òmume gini bu nka nke unu meworo? ùnu amaghi na nwoke nke di kam nāriba ama n'ezie?

Jenesis 44