13. Ha we dọwa uwe-nb͕okwasi-ha, onye ọ bula o bo inyinya-ibu-ya ibu, ha we laghachi n'obodo.
14. Juda na umu-nne-ya we ba n'ulo Josef; ma ya onwe-ya nọ kwa n'ebe ahu rue mb͕e ahu: ha we da n'ala n'iru ya.
15. Josef we si ha, Òmume gini bu nka nke unu meworo? ùnu amaghi na nwoke nke di kam nāriba ama n'ezie?
16. Juda we si, Gini ka ayi gāsi onye-nwem? gini ka ayi gēkwu? àyi gēsi kwa aṅa gu onwe-ayi na ndi ezi omume? Chineke achọputawo ajọ omume ndi-orù-gi: le, ayi aghọworo onye-nwem ndi-orù, ma ayi onwe-ayi ma onye ahu nke achọta-woro ọkwa ahu n'aka-ya.
17. Ọ si, Ya burum ihe-árú ime nka: nwoke ahu achọtaworo ọkwa ahu n'aka-ya, ọnye ahu gāghọrọm orù; ma unu onwe-unu, rigo-kurunu nna-unu n'udo.
18. Juda we biakute ya nso, si, Biko, onye-nwe m, biko, ka orù-gi kwue okwu na nti onye-nwe m, iwe-gi adi-kwa-la ọku n'aru orù-gi: n'ihi na otú i di, otú ahu ka Fero di kwa.
19. Onye-nwem juru ndi-orù-ya, si, Ùnu nwere nna ma-ọbu nwa-nne?
20. Ayi we si onye-nwem, Ayi nwere nna, bú agadi, na otù nwa agadi-ya, bú onye ntà; nwa-nne-ya anwuruwo kwa, ọ we fọdu nwata ahu nání ya nye nne-ya, nna-ya hukwara ya n'anya.
21. I we si ndi-orù-gi, Me ka ọ ridakutem, ka m'we tukwasi anyam n'aru ya.
22. Ayi we si onye-nwem, Nwa-okoro ahu apughi irapu nna-ya: asi kwa na ọ rapu nna-ya, nna-ya gānwu.
23. I we si ndi-orù-gi, Ọ buru na nwa-nne-unu nke-ntà esoghi unu ridata, unu agaghi-ahu irum ọzọ ma-ọli.
24. O rue, mb͕e ayi rigokuru orù-gi, bú nnam, na ayi gosiri ya okwu nile nke onye-nwem.
25. Nna-ayi we si, Jeghachinu, zutara ayi nwantī ihe-oriri.
26. Ayi we si, Ayi apughi irida: ọ buru na nwa-nne-ayi nke-ntà eso ayi je, ayi gārida kwa; n'ihi na ayi apughi ihu iru nwoke ahu, ma ọ buru na nwa-nne-ayi nke-ntà esoghi ayi je.
27. Orù-gi, bú nnam, we si ayi, Unu onwe-unu mara na umu-ndikom abua ka nwunyem muru nyem:
28. otù nime ha we si n'ebe m'nọ pua, m'we si, N'ezie anu-ọhia adọb͕usiwo ya; ahughi-kwam ya rue ub͕u a:
29. ma ọ buru na unu ekupu kwa nka n'irum, ajọ ihe adakwasi kwa ya, unu gēweda isi-awọm rue ala-mọ n'ihe ọjọ.
30. Ma ub͕u a, mb͕e m'gābiakute orù-gi, bú nnam, ma nwa-okoro ahu esoghi ayi bia; ebe ekekọtara nkpuru-obi-ya na nkpuru-obi nwa-okoro ahu;
31. o gēru kwa, mb͕e ọ huru na nwa-okoro ahu esoghi ayi bia, na ọ gānwu: ndi-orù-gi gēweda kwa isi-awọ orù-gi, bú nna-ayi, rue ala-mọ na nwuta.