29. Reuben we biaghachi n'olùlù ahu; ma, le, Josef anọghi n'olùlù ahu; ọ we dọwa uwe-ya nile.
30. O we laghachikuru umu-nne-ya, si, Nwata ahu anọghi; ma mu onwem, òle ebe mu onwem gēje?
31. Ha we chiri uwe Josef, b͕u kwa nkpi, biaye uwe ahu nime ọbara-ya,
32. ziga uwe-nwuda ahu nwere aka, chita ya nye nna-ha, si, Nka ka ayi hutaworo: biko, mata ma uwe nwa-gi ka ọ bu ma-ọbu na ọ bughi ya.
33. Ọ we mata ya, si, Ọ bu uwe nwam; ajọ anu eriwo ya; anu-ọhia adọb͕uwo Josef n'ezie.
34. Jekob we dọwa uwe-nb͕okwasi-ya nile, yiri ákwà-nkpe n'úkwù-ya, ruru nwa-ya újú ọtutu ubọchi.