9. Ma ndia bu osuso-ọmumu Isọ, nna Edom, n'ugwu Sia.
10. Ndia bu aha umu-ndikom Isọ: Elifaz nwa Eda nwunye Isọ, Reuel nwa Basemat nwunye Isọ.
11. Umu-ndikom Elifaz bu Timan, na Oma, na Zefo, na Gatam, na Kenaz.
12. Timna bukwara Elifaz nwa Isọ iko-nwayi; ọ muara Elifaz Amalek: ndia bu umu-ndikom Eda nwunye Isọ.
13. Ndia bu kwa umu-ndikom Reuel; Nahat, na Zera, na Shama, na Miza: ndia bu umu-ndikom Basemat nwunye Isọ.
14. Ndia bu kwa umu-ndikom Ọhọlibama nwa-nwayi Ana, bú nwa-nwayi Zibeon, nwunye Isọ: o we muara Isọ Jeush, na Jalam, na Kora.
15. Ndia bu ndi-isi nke umu Isọ: umu-ndikom Elifaz ọkpara Isọ; Timan onye-isi, Oma onye-isi, Zefo onye-isi, Kenaz onye-isi.
16. Kora onye-isi, Gatam onye-isi, Amalek onye-isi: ndia bu ndi-isi Elifaz n'ala Edom; ndia bu umu-ndikom Eda.
17. Ndia bu kwa umu-ndikom Reuel nwa-nwoke Isọ; Nahat onye-isi, Zera onye-isi, Shama onye-isi, Miza onye-isi: ndia bu ndi-isi Reuel n'ala Edom; ndia bu umu-ndikom Basemat nwunye Isọ.