3. na Basemat nwa-nwayi Ishmael, nwa-nne-nwayi Nebaiot.
4. Eda we muara Isọ Elifaz; Basemat mukwara Reuel;
5. Ọhọlibama mu-kwa-ra Jeush, na Jalam, na Kora: ndia bu umu-ndikom Isọ, nke amuru nye ya n'ala Kenean.
6. Ma Isọ chiri ndinyom-ya, na umu-ya ndikom, na umu-ya ndinyom, na madu nile nke ulo-ya, na anu-ulo-ya, na anumanu-ya, na ihe nile ọ nwetara, nke ọ kpatarari n'ala Kenean; ọ we si n'iru Jekob, bú nwa-nne-ya, je ala ọzọ.
7. N'ihi na àkù-ha riri nne kari ibikọ n'otù nke ọnọdu-ọbìa-ha nile apughi kwa inagide ha n'ihi anu-ulo-ha.
8. Isọ we biri n'ugwu Sia: Isọ bu Edom.
9. Ma ndia bu osuso-ọmumu Isọ, nna Edom, n'ugwu Sia.
10. Ndia bu aha umu-ndikom Isọ: Elifaz nwa Eda nwunye Isọ, Reuel nwa Basemat nwunye Isọ.
11. Umu-ndikom Elifaz bu Timan, na Oma, na Zefo, na Gatam, na Kenaz.
12. Timna bukwara Elifaz nwa Isọ iko-nwayi; ọ muara Elifaz Amalek: ndia bu umu-ndikom Eda nwunye Isọ.
13. Ndia bu kwa umu-ndikom Reuel; Nahat, na Zera, na Shama, na Miza: ndia bu umu-ndikom Basemat nwunye Isọ.
14. Ndia bu kwa umu-ndikom Ọhọlibama nwa-nwayi Ana, bú nwa-nwayi Zibeon, nwunye Isọ: o we muara Isọ Jeush, na Jalam, na Kora.