15. Ndia bu ndi-isi nke umu Isọ: umu-ndikom Elifaz ọkpara Isọ; Timan onye-isi, Oma onye-isi, Zefo onye-isi, Kenaz onye-isi.
16. Kora onye-isi, Gatam onye-isi, Amalek onye-isi: ndia bu ndi-isi Elifaz n'ala Edom; ndia bu umu-ndikom Eda.
17. Ndia bu kwa umu-ndikom Reuel nwa-nwoke Isọ; Nahat onye-isi, Zera onye-isi, Shama onye-isi, Miza onye-isi: ndia bu ndi-isi Reuel n'ala Edom; ndia bu umu-ndikom Basemat nwunye Isọ.
18. Ndia bu kwa umu-ndikom Ọhọlibama nwunye Isọ; Jeush onye-isi, Jalam onye-isi, Kora onye-isi: ndia bu ndi-isi Ọhọlibama nwa-nwayi Ana, nwunye Isọ.
19. Ndia bu umu Isọ, ndia bu kwa ndi-isi-ha: nke ahu bu Edom.
20. Ndia bu umu-ndikom Sia onye Hoa, ndi bi n'ala ahu; Lotan, na Shobal, na Zibeon, na Ana,
21. na Dishon, na Iza Dishan: ndia bu ndi-isi ndi Hoa, umu Sia n'ala Edom.
22. Umu-ndikom Lotan bu Hori na Himam; nwanne-nwayi Lotan bu kwa Timna.
23. Ndia bu kwa umu-ndikom Shobal; Alvan, na Manahat, na Ibal, na Shefo, na Onam.
24. Ndia bu kwa umu-ndikom Zibeon; Aia, na Ana: onye ahu bu Ana onye hutara isi-iyi nke miri di ọku n'ọzara, mbe ọ nāzù inyinya-ibu Zibeon, bú nna-ya, nwere.
25. Ndia bu kwa umu-ndikom Ana; Dishon, na Ọhọlibama nwa-nwayi Ana.