Jenesis 35:21-29 Bible Nso (IGBOB)

21. Israel we bulie ije, seti ulọ ikwū ya n'ofè ulo-elu Ida.

22. O rue, mb͕e Israel biri n'ala ahu, na Reuben jere dinayere Bilha, bú iko-nwayi nna-ya: Israel we nu ya.Ma umu-ndikom Jekob di iri na abua:

23. umu-ndikom Lia; Reuben, bú ọkpara Jekob, na Simeon, na Livai, na Juda, na Isaka, na Zebulun:

24. umu-ndikom Rechel; Josef na Benjamin:

25. umu-ndikom Bilha, bú nwayi nējere Rechel ozi; Dan na Naftali:

26. umu-ndikom Zilpa, bú nwani nējere Lia, ozi; Gad na Asha: ndia bu umu-ndikom Jekob, nke amuru nye ya na Padan-eram.

27. Jekob we biakute Aisak, bú nna-ya, na Mamre, bú Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron), ebe Abraham na Aisak nọrọ dika ọbìa.

28. Ubọchi Aisak we buru ọgu arọ iteghete.

29. Aisak we kubie ume, nwua, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ, ọ bu agadi, ubọchi-ya jukwara ya afọ: Isọ na Jekob, bú umu-ya ndikom, we lìe ya.

Jenesis 35