7. Umu-ndikom Jekob we si n'ọhia bata mb͕e ha nuru ya: ọ nēwuta ndikom ahu, ha nēwe iwe di ọku nke-uku, n'ihi na ọ bu ihe-nzuzu ka o mere n'Israel, n'idinayere nwa-nwayi Jekob; nke nēkwesighi ime otú a.
8. Hemoa we kpayere ha uka, si, Shekem, bú nwam, nkpuru-obi-ya nāhu nwa-unu nwayi n'anya si-ike: biko, werenu ya nye ya na nwunye.
9. Ka ayi na unu nālurita kwa nwunye; nyenu ayi umu-unu ndinyom, kurukwanu umu-ayi ndinyom n'onwe-unu.
10. Ayi na unu gēbi kwa: ala nka gādi n'iru unu; birinu nāzukwanu ahia nime ya, nwe-kwa-nu ihe-onwunwe nime ya.