Jenesis 31:9-11 Bible Nso (IGBOB)

9. Chineke we napu anu-ulo nna-unu, nyem.

10. O rue, na mb͕e ìgwè ewu na aturu turu ime, na ewelirim anyam abua, hu nime nrọ, ma, le, nkpi nile nke nāb͕a ìgwè ewu dere ọcha, tu kwa agwa, tu kwa akika.

11. Mọ-ozi nke Chineke we sim nime nrọ ahu, Jekob; m'we si, Lekwam.

Jenesis 31