10. O rue, na mb͕e ìgwè ewu na aturu turu ime, na ewelirim anyam abua, hu nime nrọ, ma, le, nkpi nile nke nāb͕a ìgwè ewu dere ọcha, tu kwa agwa, tu kwa akika.
11. Mọ-ozi nke Chineke we sim nime nrọ ahu, Jekob; m'we si, Lekwam.
12. Ọ si, Biko, welie anya-gi abua, hu, nkpi nile nke nāb͕a ìgwè ewu dere ọcha, tu kwa agwa, tu kwa akika: n'ihi na ahuwom ihe nile Leban nēme gi.
13. Mu onwem bu Chineke nke Betel, ebe i tere ogidi manu, ebe i kwerem nkwa: ub͕u a bilie, si n'ala nka pua, laghachi n'ala nke ọmumu-gi.