Jenesis 31:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọ we nu okwu nile nke umu-ndikom Leban, si, Jekob achiriwo ihe nile nna-ayi nwere; o sitekwara n'ihe nna-ayi nwere kpata àkù a nile.

2. Jekob we hu iru Leban, ma, le, ọ dighi n'ebe ọ nọ dika ọ di na mb͕e gara aga.

3. Jehova we si Jekob, Laghachi n'ala nna-gi-hà, laghachikuru umu-nna-gi; M'gānọyekwara gi.

4. Jekob we zìe kpọ Rechel na Lia bia n'ọhia rue ebe ìgwè ewu na aturu-ya di,

5. ọ si ha, Mu onwem nāhu iru nna-unu, na ọ dighi n'ebe m'nọ dika ọ di na mb͕e gara aga; ma Chineke nke nnam anọyeworom.

6. Unu onwe-unu makwara na ewerewom ikem nile fè nna-unu.

7. Ma nna-unu akwawom emò, we b͕anwe ugwọ-olum ub͕ò iri; ma Chineke ekweghi ya mejọm.

8. Ọ buru na otú a ka ọ nāsi, Ndi turu agwa gābu ugwọ-ọlu-gi; ìgwè ewu na aturu nile we nāmu umu turu agwa: ma ọ buru na otú a ka ọ nāsi, Ndi dere ọcha gābu ugwọ-ọlu-gi; ìgwè ewu na aturu nile we nāmu umu dere ọcha.

Jenesis 31