Jenesis 26:23-35 Bible Nso (IGBOB)

23. O si n'ebe ahu rigorue Bia-sheba.

24. Jehova we me ka ọ hu Ya anya n'abali ahu, si, Mu onwem bu Chineke nke Abraham nna-gi: atula egwu, n'ihi na Mu na gi nọ, M'gāgọzi kwa gi, me ka nkpuru-gi ba uba n'ihi Abraham, bú orùm.

25. Ọ we wue ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, kpọkue aha Jehova, ma ulo-ikwū-ya n'ebe ahu: ọ bu kwa n'ebe ahu ka ndi-orù Aisak gwuru olùlù-miri.

26. Abimelek we si na Gera jekuru ya, ya na Ahuzat, bú eyì-ya na Faikol, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya.

27. Aisak we si ha, Gini mere unu ji biakutem, ebe unu onwe-unu nākpọm asì, we si n'ebe unu nọ zilagam?

28. Ha si, Ayi ahuwo nke-ọma na Jehova nọyere gi: ayi we si, Biko, ka iṅu-iyi di n'etiti ayi, bú n'etiti ayi na gi, ka ayi na gi b͕a kwa ndu;

29. na i gaghi-eme ayi ihe ọjọ ma-ọli dika ayi nēmetughi gi aka na dika ayi meworo gi nání ezi ihe, ayi we zilaga gi n'udo: ub͕u a gi onwe-gi bu onye agọziri agọzi nke Jehova.

30. Ọ we mere ha oké oriri, ha rie ṅu kwa.

31. Ha bilie n'isi-ututu, ṅuritara onwe-ha iyi: Aisak we zilaga ha, ha si n'ebe ọ nọ la n'udo.

32. O rue n'ubọchi ahu, na ndi-orù Aisak biara, kọrọ ya akukọ bayere olùlù-miri ahu nke ha gwuru, si ya Ayi achọtawo miri.

33. Ọ kpọ ya Shiba: n'ihi nka aha obobo ahu bu Bia-sheba rue ta.

34. Mb͕e Isọ b͕ara ọgu arọ abua ọ luru Judit na nwunye, bú nwa-nwayi Beiri onye Het, ya na Basemat, bú nwa-nwayi Ilon onye Het:

35. ha we ghọrọ Aisak, ghọkwara Rebeka, ihe mọ-ilu.

Jenesis 26