Jenesis 24:64-67 Bible Nso (IGBOB)

64. Rebeka we welie anya-ya abua, hu Aisak, si n'elu camel-ya rida.

65. Ọ si orù ahu, Ònye bu nwoke ahu nke nēje ije n'ọhia izute ayi? Orù ahu we si, Onye ahu bu onye-nwem: Rebeka we were ákwà-nkpudo-ya kpuchie onwe-ya.

66. Orù ahu we kọrọ Aisak akukọ bayere ihe nile o mere.

67. Aisak we me ka Rebeka bata n'ulo-ikwū Sera, bú nne-ya, o we kuru Rebeka, o we ghọ nwunye-ya; Aisak we hu ya n'anya: ewe kasie Aisak obi ka nne-ya nwusiri.

Jenesis 24