Jenesis 21:10-21 Bible Nso (IGBOB)

10. Ọ we si Abraham, Chupu orù-nwayi a na nwa-ya nwoke: n'ihi na nwa-nwoke orù-nwayi a agaghi-eso nwam nwoke, bú Aisak, nweta ihe-gi.

11. Ma ihe ahu jọrọ njọ nke-uku n'anya Abraham n'ihi nwa-ya nwoke.

12. Chineke we si Abraham, Ka ọ ghara ijọ njọ n'anya-gi n'ihi nwa-okoro a, na n'ihi orù-gi nwayi: ihe nile Sera nāsi gi me, ge nti n'olu-ya; n'ihi na ọ bu nime Aisak ka agākpọrọ gi nkpuru.

13. Ọzọ kwa, nwa orù-nwayi ahu ka M'gēme ka ọ ghọ mba, n'ihi na nkpuru-gi ka ọ bu.

14. Abraham we bilie n'isi-ututu, were achicha na karama-akpukpọ miri nye Hega, tukwasi ya n'ubu-ya, ọ nye kwa ya nwa-ya, zilaga ya: ọ we je, nāwaghari n'ọzara Bia-sheba.

15. Miri we gwu na karama-akpukpọ ahu, ọ we tuda nwa ahu n'okpuru otù nime osisi ntà,

16. je, nọdu ala n'onwe-ya na ncherita-iru ya n'ebe di anya, dika ndi nāb͕a uta gāb͕aru; n'ihi na ọ siri, Ka m'ghara ilekwasi ọnwu nwam anya. Ọ we nọdu na ncherita-iru ya, welie olu-ya, kwa ákwá.

17. Chineke we nu olu nwa-okoro ahu; mọ-ozi nke Chineke we si n'elu-igwe kpọ Hega òkù, si ya, Gini nēme gi, Hega? atula egwu; n'ihi na Chineke anuwo olu nwa-okoro ahu n'ebe ọ nọ.

18. Bilie, palie nwa-okoro ahu, jide ya n'aka-gi; n'ihi na mba uku ka M'gēme ya ka ọ ghọ.

19. Chineke we meghe anya-ya abua, ọ hu olùlù-miri; ọ we je, b͕ajue karama-akpukpọ-ya na miri, me ka nwa-okoro ahu ṅua.

20. Chineke we nọyere nwa-okoro ahu, ọ we tó etó, biri n'ọzara, ghọ ọ̀kà-uta, ka o nētó etó.

21. O biri n'ọzara Peran: nne-ya we si n'ala Ijipt lutara ya nwunye.

Jenesis 21