1. Jehova we leta Sera dika Ọ siri, Jehova we me Sera dika O kwuru.
2. Sera we turu ime, muara Abraham nwa-nwoke n'agadi-ya, na mb͕e ahu akara àkà nke Chineke kpayere Abraham uka bayere ya.
3. Abraham we kpọ aha nwa-ya nwoke nke amuru nye ya, onye Sera muru nye ya, Aisak.
4. Abraham we bìe nwa-ya nwoke, bú Aisak, úgwù mb͕e o ruru ubọchi asatọ, dika Jehova nyere ya iwu.
5. Abraham b͕ara ọgu arọ ise, mb͕e amuru ya Aisak, bú nwa-ya nwoke.
6. Sera we si, Ichì-ọchì ka Chineke doziworom; onye ọ bula nke nānu ya gāchì ọchì bayerem.
7. Ọ si kwa, Ònye gāsiwori Abraham, Sera gēnye umu ara? n'ihi na amuworom ya nwa-nwoke n'agadi-ya.
8. Nwa ahu we tó etó, eme ka ọ rapu ara: Abraham we me oké oriri di uku n'ubọchi emere ka Aisak rapu ara.
9. Sera we hu nwa-nwoke Hega, bú nwayi Ijipt, nke ọ mururi Abraham, ka ọ nāchì ọchì nke-uku.
10. Ọ we si Abraham, Chupu orù-nwayi a na nwa-ya nwoke: n'ihi na nwa-nwoke orù-nwayi a agaghi-eso nwam nwoke, bú Aisak, nweta ihe-gi.
11. Ma ihe ahu jọrọ njọ nke-uku n'anya Abraham n'ihi nwa-ya nwoke.
12. Chineke we si Abraham, Ka ọ ghara ijọ njọ n'anya-gi n'ihi nwa-okoro a, na n'ihi orù-gi nwayi: ihe nile Sera nāsi gi me, ge nti n'olu-ya; n'ihi na ọ bu nime Aisak ka agākpọrọ gi nkpuru.
13. Ọzọ kwa, nwa orù-nwayi ahu ka M'gēme ka ọ ghọ mba, n'ihi na nkpuru-gi ka ọ bu.