Jenesis 19:15-25 Bible Nso (IGBOB)

15. Ma mb͕e chi bọrọ, ndi-mọ-ozi ahu nukpọrọ Lot, si, Bilie, chiri nwunye-gi, na umu-gi ndinyom abua ndi ahuru n'ebe a; ka ewe ghara ikpochapu gi n'ahuhu ajọ omume obodo a.

16. Ma ọ b͕agwojuru ya anya; ndikom ahu we jide aka-ya, jide kwa aka nwunye-ya, jide kwa aka umu-ya ndinyom abua; n'ihi na Jehova nwere ọmiko n'aru ya: ha we me ka ọ puta, me ka ọ nọdu n'azu obodo.

17. O rue, mb͕e ha mesiri ka ha puta n'azu obodo, na ọ siri, Wepuga onwe-gi n'ihi ndu-gi; elekwala anya n'azu gi, eguzokwala na Gburugburu-ala a nile; wepuga onwe-gi je ugwu ahu, ka ewe ghara ikpochapu gi.

18. Lot we si ha, É-è, biko, onye-nwem:

19. biko, le, orù-gi ahutawo amara n'iru gi, i mewo kwa ka ebere-gi di uku, nke i meworom n'idebem ndu; mu onwem apughi kwa iwepuga onwem je ugwu, ka ihe ọjọ ahu we ghara irapara n'arum, m'we nwua:

20. biko, le, obodo a di nso ib͕alaga n'ebe ahu, nke ahu bu kwa obodo ntà: biko, ka m'wepuga onwem je ebe ahu, (ọ̀ bughi obodo ntà?) nkpuru-obim gādi kwa ndu.

21. Ọ si ya, Le, m'huwo kwa gi iru-ọma n'okwu a, na m'gaghi-akwatu obodo a nke i kwuworo okwu bayere ya.

22. Me ngwa, wepuga onwe-gi je ebe ahu; n'ihi na apughm ime ihe rue mb͕e i gābà n'ebe ahu. N'ihi nka ka akpọrọ aha obodo ahu Zoa.

23. Anyanwu awawo n'elu uwa mb͕e Lot batara nime Zoa.

24. Jehova we me ka brimstone na ọku si n'elu-igwe zokwasi Sọdọm na Gọmọra dika miri site n'ebe Jehova nọ;

25. O we kwatue obodo ndia, na Buruburu-ala ahu nile, na ndi nile bi n'obodo ahu nile, na ihe-opupú nke ala.

Jenesis 19