15. N'ihi nka ka m'putara izute gi,Ichọsi iru-gi ike, m'we chọputa gi.
16. Ákwà-nb͕abá mara nma ka m'b͕abáworo n'ihe m'ji edina,Bú ákwà turu agwa nke ogho Ijipt.
17. Ewerewom myrrh na aloes na cinnamonFesa ihe-ndinam.
18. Bia, ka afọ jubiga ayi ókè n'ikwa-iko rue ututu;Ka ayi me ka obi tọ ayi utọ n'ihu-n'anya nile.
19. N'ihi na dim anọghi n'ulo,O jewo ije di anya:
20. Ọ werewo akpa ego n'aka-ya;N'ubọchi ọnwa-ndọzu ka ọ gālata.
21. O were ọtutu urà-ya wezuga nwa-okorọbia ahu ka ọ ba n'ulo-ya,O were okwu ire-utọ nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya nufue ya.
22. Nwa-okorọbia ahu nējeso ya na mberede,Dika ehi si abia n'ob͕ub͕u-ya,Ma-ọbu dika nkpọrọ-ukwu si abia n'idọ-aka-na-nti nke onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya;